AKỤKỌ ỤWA

ỤMAHỊ BAA APC NDỊ GỌVANỌ MPAGHARA ỌWỤWA ANYANWỤ NDỊDA NDỊ ỌZỌ GA-ESOKWA YA-ỤZỌDỊMMA

Abụja : Gọvanọ Hope Ụzọdịmma nke Imo Steeti ekwuola na ndị Gọvanọ Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda ga-enubata n’òtù ndọrọndọrọ ọchịchị APC n’ígwè ozigbo Gọvanọ Devidi Ụmahị nke Ebọnyị siri PDP bata APC, ka ọ na-achọ ime n’oge adịghị anya.

Ụzọdịmma kwuru nkea ụnyahụ, n’ọgbakọ ya na Onyeisi Oche Nchere oge nke APC, onye bụkwa Gọvanọ Yobe Steeti, Mai Mala Buni, ndị òtù ya ndị ọzọ nwere n’isi ụlọ ọrụ òtù ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ n’Abụja.

Ọtụtụ Ndigbo hụtara PDP dịka òtù ndọrọndọrọ ọchịchị n’amaghị ihe ọma maka etu ndị isi ha siri jụ ikenye Ndigbo ikike iji ya were zọọ ọkwa Onyeisiala n’afọ 2023, n’agbanyeghị ahụhụ nile ndị mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda taworo maka PDP.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close