AKỤKỌ ỤWA

“ỤMAHỊ, MBANỤ! E SOGHI M GỊ ABA APC” KỌMISHỌNA N’EBỌNYỊ

Abakiliki: Kọmishọna na-ahụ maka Mmekọrịta n’ime Gọọmenti ( Inter Governmental Affairs), n’Ebọnyị Steeti, Hon Laz Nweru Ogbee agbaala alụkwaghịm n’ọrụ maka na ọ chọghị iso Gọvanọ Steeti ahụ, Omenka Devidi Ụmahị were banye òtù ndọrọndọrọ ọchịchị APC.

Ogbee, onye tinyere akwụkwọ alụkwaghịm ụbọchị Tọọzdee kwuru na ya achọghị ịkpa agwa dịka “Onye amaghị ihe ọma” site na isoro wụkpuo APC n’agbanyeghị uru nile o ritere na PDP.

Kaosiladi, ọ gọkwara Gọvanọ Ụmahị na ndị so ya aba APC ezigbo ọfọ.

Kemgbe Gọvanọ Ụmahị kwupụtara mmasị ya ịba APC ọtụtụ mmadụ kwadoro ya maka na ọpụpụ ya gbadoro ụkwụ na ọjụjụ PDP jụrụ ikenye ndị Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda ikike iji aha ha were zọọ ọkwa Onyeisiala n’afọ 2023.

Ụfọdụ ndị hụtara Ụmahị dịka onye na-agbara ndi Ugwu odibo katọkwara ya.

Ka anyị na-elenu ụwa. E mee elu mee ala, PDP e mejọọla Ndigbo.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close