Uncategorized

ỤMỤ IGBO ABỤỌ JI ÍBÚ NTỤ BỤRỤ AKAJIAKỤ ANYỤWỌ MKPỤRỤ COCAINE KARỊRỊ 3KG, KA NDỊ NDLEA NWỤCHIKỌRỌ HA

Abụja – Ụmụ Igbo abụọ ndị ji íbú ntụ bụrụ akajiakụ anọrọla n’ụlọ nnyocha ndị Ụlọ ọrụ National Drug Law Enforcement Agency(NDLEA) were nyụọ mkpụrụ ọ́gwụ̀ ike cocaine karịrị kilogram atọ, nke ha loro.

Aka kpaara ha abụọ n’ọ́dụ̀ ụgbọelu Nnamdi Azikiwe, Abụja, oge ha si n’Addis Ababa, Ethiopia were wụchie.

Ka ha nọrọ abalị atọ n’aka ndị NDLEA, Ebere Onoh, onye dị afọ iri anọ na itoolu nyụpụtara cocaine dị kilogram abụọ n’ụma (2.137kg), ebe Christian Ifeanyi Ogbuji, onye dị afọ iri anọ na abụọ nyụrụ cocaine fọrọ ntakịrị ka o ruo kilogram abụọ (1.986kg).

Hmmmm, ọrụ ha akụọla! Ego ọkụ enweghị uru dị ya chaa chaa

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close