AKỤKỌ ỤWA

WIKE, BIKO RỊỌ NDỊ SOJA KA HA KWỤSỊ ỊWAKPO NDỊ BE ANYỊ – EZE OBIGBO

Pọt Haakọtụ: Eze Maịk Nwaji, Eze Ọdịnala ndị Obigbo arịọwo Gọvanọ Rivas Steeti, Nyesom Wike ụbọchị Tuuzdee ka o nyere aka rịọ ndị soja ka ha kwụsị ịwakpo ndị obodo ahụ.

Kemgbe enwechara ọgbaghara sitere na ngagharị iwe#EndSars n’ebe ahụ, ndị soja ka na-aga n’ụlọ n’ụlọ na-akpụrụ ndị mmadụ sị na ha na-achọ ndị IPOB.

Na mkparịta ụka ya na ndị nta akụkọ Onye Eze Ọdịnala ahụ kwuru sị, “

Eze Nwaji rịọrọ ndị soja ka ha na-arụ ọrụ ha etu kwesịrị ekwesị, ghara ịna-emekpa ndị be ha ahụ.

“Ọtụtụ ndị IPOB bidoro nsogbu a agbafuchaala. O nwegodiri onye bụ onye IPOB, Gọvanọ kwuru na – amachiela mmemme ndị IPOB na Steeti a. A nụghị oge ọ sịrị ka a gawa n’ụlọ n’ụlọ ga chọwa ha”

Kaosiladi, Ọnụ na-ekwuru Ụ́sụ̀ụ̀ Isii Ndị Agha Naịjiriya (6 Division), Pọt Haakọtụ, Major Charles Ekeocha kwuru na ndị soja na Steeti ahụ na-arụ ọrụ ha etu kwesịrị ekwesị.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close