AKỤKỌ ỤWA
WIKE BỤ ONYE IGBO N’AMAGHỊ ONWE YA-BNL


Òtù Biafra Nations League (BNL) akatọọla Nyesom Wike, Gọvanọ Rivas Steeti, onye ha sịrị bụ Onye Igbo n’amaghị onwe ya ma ọ bụ ébó o si.
Wike kwuru na ndị IPOB na – achọ ịgbanwe aha ụfọdụ obodo na Rivas Steeti, na ọ gaghị ekwe ka nke ahụ mee.
Kaosiladi, Osote Onyeisi BNL, Ebuta Akor Takon kọwara Wike dịka, “Onye ekwurekwu n’anaghị ama ihe ọ na-ekwu ọtụtụ oge”
“Rivas so na Bịafra. Wike kpachara anya chọọ ibute nsogbu n’etiti ébó dị iche iche dị na Steeti ahụ site na ịsị na ọ bụghị onye Igbo maka na ọ maghị agụgụala Rivas Steeti nakwa Mpaghara Naịja Delta”
O kkwukwara na Wike ịsị na ndị Ikwere si Bini bụ nkọgheri ebe Ọba Bini nke laworo mmụọ kwuru na ha amaghị ndị Ikwere dịka ndị si be ha were pụọ ije.