NKE NA-EME UGBUA

“WISE MAN” KRISTOVA, OSOTE T. B. JOSHUWA AMALITEWO ỤKA NKE YA N’ENUGWU

Enugwu: “Wise man” Kristova Ọjị awụchiela Enugwu n’ike n’ebube ịmalite ụka nke ya a kpọrọ “City of Jesus International Ministry” (COJIM).

Ụkọchukwu ahụ so na ndị amụma mmadụ anọ, na ahụ ọ́hụ̀, Onyeamụma T. B. Joshuwa laworo mmụọ ji arụ ọrụ.

Kaosiladi, “Wise man” Kristova, onye bụ onye Enugwu Steeti lọtara ala nna ya ịbịa malite ụka nke ya, ka e lichara nna ya ukwu, T. B. Joshuwa.

Iji gbasaa ozi banyere nkea, ndị ụmụazụ jiri

Ìgwè ụgbọala gbagharịa Enugwu nile ụnyaahụ bụ Satọdee na-ekesa akwụkwọ ozi nkesa (flyer).

Ha jikwa ígwè okwu na-eti na-asị: “Enugwu! Wise Man Kristova awụchiela! Onye ahụ unu na – ahụ na TV, ya na T. B. Joshuwa na-arụkọ, ọ wụchiela Enugwu ugbua!

“Echi (ụbọchị ụka) ga-adị egwu. Bịanụ n’ụlọ ezumezu Justice Ugwu na Royal Palace Hotel, Agbani Road, Garriki! Ọ ga-akpọtụ akpọtụ! Ọ ga-adị kpọọ kpọọ”

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close