YERIMA BỤ ONYE NKỌGHERI MAKA ỊKPỌ ABARIBE AHA – MASSOB


Enugwu : Òtù na-agba mbọ maka nnwere onwe Biafra bụ MASSOB akọwaala okwu Alahaji Yerima Shetima, Onyeisi òtù Arewa Youth Consultative Forum (AYCF) na e kwesịrị ijide Sinetọ Enyinnaya Abaribe bụ onye naara Mazị Nnamdi Kehinde Kanu, Onyeisi IPOB n’akaebe n’ụlọikpe dịka ezigbo nkọgheri.
N’ozi o zigaara ndị nta akụkọ taa, Onyeisi MASSOB, Mazị Uchenna Madụ mere ka o doo anya na nnapụ n’akaebe ụlọikpe Sinetọ Abaribe na nke Sinetọ Ali Ndume abụghị ótù ihe chaa chaa.
“Sinetọ Enyinnaya Abaribe ji aha Ndigbo nile naara Mazị Nnamdi Kanu n’akaebe ụlọikpe maka ebubo asị nkwatu ọchịchị obodo mana Sinetọ Ali Ndume gara nara n’akaebe ụlọikpe onye ohi bụ Alahaji AbdulRasheed Maina, onye zuuru ego ezumike nka ndị ọrụ bekee.
“Onye ọbụla kpara Sinetọ Abaribe aka ga-adị nkwadebe ọgụ anyị na ya”