YOROBA KWARA NA KOGI CHỌRỌ ISONYE ỤMỤNNE HA NDỊ MPAGHARA ỌDỊDA ANYANWỤ


Ịlọrịn: Ndi Yoroba nọ na Kwara nakwa Kogi Steeti ekwuputala mmasị ha isonye ụmụnne ha na ndị Mpaghara Ọdịda Anyanwụ.
N’akwụkwọ ozi òtù Kwara South Consultative Forum degaara Ụlọ Nzukọ Naịjiriya nke Josef Aderibigbe, Nnukwu Onyeisi ha tinyere aka, ha chọrọ ka e megharịa oke ala iji tinye ha na Mpaghara Ọdịda Anyanwụ, ka ha na ụmụnne ha nọrọ n’ótù mpaghara.
O kwuru na nkea bụ maka oke mmegbu ha na enweta n’aka ndị ha na ha nọ n’Ugwu Awụsa kemgbe.
Site n’akwụkwọ ozi ahụ, ndị Yoroba nwere Okpuru Ọchịchị asaa na Kwara nakwa ise na Kogi Steeti.
“Anyị chọrọ ka e tinye anyị na Mpaghara Ọdịda Anyanwụ site na imegharị ókèala. Mmegbu anyị na – a ata n’aka ndị anyị na ha nọ n’Ugwu Awụsa kemgbe akarịala
“E kenyere anyị na Mpaghara Ugwu Awụsa n’ajụghị ihe bụ mmasị anyị. Nke a megidere iwu ótù Mbaụwa banyere nnwere onwe nakwa ikike dịịrị onye”
Hmm, Uju ahụrụ etu ndị a si ahazi onwe ha? Gịnị mere na Ndigbo na ụmụnne ha ndị nọ na Rivas, Delta nakwa Steeti ndị ọzọ n’anọghị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ agaghị ejikonwu ọnụ?