AKỤKỌ ỤWA

ZAMBỊYA GA-AMACHI NDỊ ÀMÀ JIHOVA MAKA NNUPUISI?

Lusaka: Mazị Cozmo Mumba, onye ndú ótù ndọrọndọrọ ọchịchị n’anọghị n’ọchịchị na mba Zambịya akpọọla oku ka a machie ụka ndị Àmà Jihova na mba ahụ maka nnupụisi nyere iwuala mba ahụ.

N’ozi nke onye ndú ótù ndọrọndọrọ ọchịchị National Revolution Party (NRP), o kwuru na ọ dabaghị bụ na ụka ahụ ka ga-adị na Zambịya ebe ha anaghị ekwe ukwe ala ma ọ bụ sonye na ime nhọpụta.

“Ndi ụka a na-emegide iwuala Zambịya site na ekweghị ukweala Zambịya nakwa eso nyeghị n’usoro ime nhọpụta mana ha na-erite uru ndozi obodo sitere n’aka ndị ọchịchị obodo.

“Òtù iwuala ahụ ha anaghị akwanyere ùgwù bụkwa nke nyere ha ikike ịgagharị etu masịrị ha nakwa ikike ịgbaso udiri okpukpere chi ọbụla masịrị ha, gịnị mere na ha agaghịkwa erubere òtù iwuala ahụ isi site na isonye na ime nhọpụta?

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close