NTỤGHARỊ UCHE
ZEERE ỤMỤ AGBỌGHỌ YI JIGIDA(Ọ̀RỌ̀KPỌ̀) ?


Jigida bụ ihe ụmụ nwanyị na-eyi n’úkwù iji chọọ mma mgbe gboo n’Ala-Igbo.
Kaọdịtaa, Jigida ma ọ bụ mgbajị́ ma ọ bụkwanụ ọ̀rọ̀kpọ̀ amalitewokwa ìwù ewu ọzọ dịka ihe e ji eje ekike n’etiti ụmụ agbọghọ.
Ụfọdụ ụmụ agbọghọ hụtara ya dịka ngwà achọm mma (fashion accessory).
Kaosiladi, ụfọdụ ụmụ nwoke na-ahụta ụmụ agbọghọ na-eyi Jigida n’úkwù dịka ndị gwọtara ọgwụ ha ji ekechi ụmụ nwoke ha na ha na-enwe mmekọahụ.
Ụfọdụ na-ahụtakwa ụmụ agbọghọ na-eyi ọ̀rọ̀kpọ̀ n’úkwù dịka akwụla.
O nweghị onye ma nke bụ eziokwu mana gị bụ nwatanwoke, kedụ ihe na-abịa gị n’uche ma ị hụ ka enyi gị nwanyị yi Jigida?
Hoo Haa buzikwa ebe ona akpotu. Ekene diri onye isi edemede a, ya ndi na enyere ya aka. Igbo na ekwu Hoohaa!