Uncategorized

LỌLỌ ỤJAM EWERELA ỌCHỊCHỊ DỊKA ONYEISI OCHE ÒTÙ NSE NGALABA ENUGWU

Enugwu : Lọlọ Omenka Uchenwa Ụjam, FNSE nọrọ n’uhuruchi ụnyahụ weghara ọchịchị dịka Onyeisi oche òtù jikọtara ndị Omenka na Naịjiriya bụ Nigerian Society of Engineers (NSE), ngalaba Enugwu.

N’oge mmemme nnyefe ọchịchị ahụ, Ichie Festusu Ọzọemena, FNSE, onye rịturu n’ọkwa dịka Onyeisi oche òtù ahụ gwara Lọlọ Ụjam na ndị ótù ya, ndị a na-enyefe ọchịchị ka ha jisie ike n’ọrụ, ịhụ n ótù NSE ngalaba Enugwu na-aga n’ihu.

Chetakwa na a nọrọ n’abalị iri abụọ n’asaa nke ọnwa Ọgọọst were họpụta Lọlọ Ụjam dịka nwanyị mbụ ji ọkwa onyeisi oche ótù ahu, kemgbe afọ iri isii nke ótù ahụ.

N’ozi ya ka e nyefechara ya ọchịchị n’aka, Lọlọ kwuru sị,

“Na mbụ, a na m ekele Chineke maka ohere ọma o nyere m ịgbara ya ozi. A na m ekelekwa Ichie Ọzọemena, onye nyefere m ọchịchị n’aka maka ịbụ ezigbo mmadụ.

O kwekwara nkwa na site n’ike Chineke na ọ ga-agba mbọ ịhụ na NSE ngalaba Enugwu ruru oge kwesịrị ekwesị.

Lọlọ Ụjam kwekwara nkwa na ótù ahụ ga-akwa a n’isi ụlọ ọrụ dịka o kweburu na nkwa tupu ngwụcha afọ a.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close