ARỤ! Mmọnwụ na-aṅụ Hero! Nkea mere eme na ngwụcha izu ụka gara aga. Ụmụ okorobịa na-eti mmọnwụ bịaruru ebe ndị mmadụ gbakọrọ, gbaa egwu, gbaa egwu, wụgharịa etu o siri kwesị. Ka o mechara, ụmụ nwoke nọ ebe ahụ aṅụ mmanya gwara ya na ego adịghị kama ọ chọọ mmanya,Read More →

INDIA: Flavour “N’abanịa” e mekwaala ka ọ si eme. Ozi ruru hoo!haa!! aka na-ekwu na Flavour akpọrọla “nwa ya nwoke” bụ Semah Weifur, nwa Liberia so ya agụ egwu kpụrụ isi gaa New Delhi, India Maka ịwa ya anya iji mee ka ọ hụwa ụzọ. Nwatakịrị nwoke a bụ SemahRead More →

Enugwu: Ngosipụta Nka “Word4Word Art Project” na-aga n’ihu ugbua n’Enugwu n’ogige National Gallery of Arts, Enugwu. Site na nkọwa Mazi Ikenna Nwachukwu bụ onyeisi otu Word4Word Art Project, ngosipụta  nka a ga na-abụ kwa ọnwa atọ.  Ikenna Nwachukwu, onyeisi Word4Word  Isiokwu ngosipụta nka nkea bụ “Omenala Ọchịchịrị” nke na-arụtụ akaRead More →

Abụja: Ozi na-erute anyị ntị ugbua gosiri na Onye ndu otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC bụ Sinetọ Bola Tinubu e nweela nsogbu. Etu ihe si kwụrụ ugbua, APC tiwazịrị ụzọ abụọ maka ndọrọndọrọ ndị ga-anọ n’isi na ngalaba Omebeiwu nke Gọọmenti Naijiria. Tupu ugbua, Tinubu bubu n’obi ime ka o siRead More →

Nsukka: Aka ndi uwe ojii nọ na Nsụka akparala okongwu arụrụala dinara nwatakịrị dị afọ iri. Mazị Ịmanụel Ugwu bụ onye laworo ezumike nká n’ọrụ bekee jiri ụzọ aghụghọ rabata nwatakịrị ahụ bụ Chisom Odo n’ime ụlọ site na ịdị ye gaa zụtara ya ihe. Okongwu arụrụala a, onye rụburuRead More →

Messi, aṅachaala ka ákwà! Ihe bụ akụkọ abụghị na Otu egwu bọl Liverpool nke Ingland jiri ọkpụ anọ asaghị asa were sụọ ndi otu egwu bọl Barcelona akwụ. Ihe na-ewu ị bụ na Lionel Messi, odogwu riri amosu n’egwu bọl aṅachaala ka ákwà. Ndị nkea kacha afụ ụfụ n’obi bụRead More →

Kano: Ọchịagha Hisbah na Kano Steeti, Nabahani Usman,ekwuola sa site taa bụ Mọnde bụ ụbọchị oge ebumọnụ ndị Alakụba na-amalite na ha ga-amalite ijide okenye ọbụla ha nwetara na-eri ihe n’iro. Hisbah bụ otu ọrụ nchekwa Sharia. O kwuru na sọọsọ ihe ga-eme ka ha hapụ ndị e jidere bụRead More →

Enugwu: A nọrọ taa n’ụlọ ezumezu dị na Toprank hotel, E ugwu were hiwe otu South East for President 2023 bụ otu na-agba mbọ ka ọchịchị Naịjirịa rute Ndigbo aka n’afọ 2023. N’ozi nnabata ya, onye nlekọta otu a bụ Ụkọchukwu Oké Chukwu Obiọha kwuru na oge eruola mgbe onyeRead More →

Legọsị: Otu nwata nwoke afọ tara mmiri anọrọla na Legọsị chee nwatakịrị oku n’aka bụ nwa nwanne ya nwoke ncha mmiri mmiri e ji asa efere bụ Sunlight. Nwoke ahụ aha ya bụ Ifeanyị Udeoye onye gbara afọ iri atọ n’otu ma bụrụkwa onye Ihiala dị n’Anambara Steeti kọwara naRead More →

IBADAN –Otu nwokọrọbịa bụ Azeez Morufu ka aka nọrọ ụnyahụ na Dugbe dị n’Ibadan kpara ka ọ na-ewere ego n’igwe ATM n’ejighi kaadị ATM ọbụla. Ọ bụzị onye na-agafe hụrụ ihe ịtụnanya a were tie mkpu mere ka ndi nche ụlọakụ ahụ dị n’akụkụ ụlọọrụ Redio Naịjiriya, Ibadan were jidezie ya.Read More →