AKỤKỌ ỤWA

IKESA IHE NKIRI Ọ̀TỌ́ ONYE NDỌRỌ NDỌRỌ ỌCHỊCHỊ ỌSỤN: ATỤWO MMADỤ ISE NGA

Osogbo – Ọkaikpe Nathaniel Ayo-Emmanuel nke Ụlọikpe Etiti n’Osogbo, Osun Steeti nọrọ ụbọchị Tuuzdee were tụọ ụmụ nwoke ise nga maka ikesa ihe nkiri Onye bụbu Ọnụ na-ekwuru Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Osun Steeti, Timothy Owoeye ebe ọgba ọ̀tọ́ nakwa ịnapụ ya ego dị Nde Naira iri atọ na asatọ.

N’afọ 2018, ha mebere ihe nkiri dị tịnkọm tịnkọm iri na atọ, ebe ha sị na ya bụ nwaamadị bịa n’obodo ha gbara ọtọ na-achụ àjà.

Ụlọikpe ahụ tụrụ mmadụ ise ahụ gụnyere Kazeem Agbabiaka, Rasheed Ojonla, Babatunde Oluajo, Adebiyi Kehinde, Femi Oseni na Oyebanji Oyeniyi nga afọ ise.

Ụlọọrụ ndị Uweojii Ngalaba Osun Steeti nwụchikọrọ mmadụ ise ahụ ka ha jizi ihe nkiri ahụ were napụ ya ọkpụrụkpụ ego ma gakwaa n’ihu na iyija ya.

Ọkaikpe Ayo-Emmanuel kwuru hoo!haa! na mmadụ ise ahụ ekwesịghị imere ebere maka na hiwere òtù ndị ji nyija na aghụghọ anapụ ndị mmadụ ego n’eleghị anya n’azụ.

Hmmm! Isi kote èbù, ọ gbaa ya gwoo gwoo.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close