AKỤKỌ ỤWA

ONYE AGBORO OBIOAKPỌ EJIRIWO ỌKPỌ TIGBUNYỤỌ ONYE KEKE ANYA MAKA ₦200

Ígwéọ́chá – Ebele gburu ụnyahụ bụ ụbọchị Tọọzdee n’Ogbogoro dị n’Okpuru Ọchịchị Obio/Akpọ, Rivas Steeti oge ótù onye agboro e jiri aha òtútú ya bụ Osisi mara, jiri ọkpọ tigbunyụọ ótù nwata nwoke onye keke, Esikak Esieme anya, ka ha nwere nghọtahie.

Onye nọ oge ahụ kwuru na ihe butere esemokwu ahụ bụ Narị Naira abụọ, N200, ndị agboro na -ana ya. Ọ bụ oge ha na-enwezi nghọtahie ahụ ka Osisi jiri were ọkpọ pịatuo onye keke ahụ. Nwaamadị ahụ daruru ala mere ndị ótù ya buru ya gbaga ụlọ ọgwụ. Kaosiladi, ndị Dọkịnta kwuru na ọ nwụọla pịịị.

Nke a meziri ndị keke obodo ahụ jiri malite ngagharị iwe. Mazị Ivumba Friday, Onyeisi ha kwuru na ya bụ onye agboro ahụ eteela o ji emekpa ndị ótù ha ahụ, na eme nta eme ímó.

Ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe Ojii Steeti ahụ, SP Grace Iringe-Koko kwuru na ya ozi o nwetara bụ na ụmụ nwoke ahụ lusoro onwe ya ọgụ. O kwukwara na ndị Uwe Ojii na – ámà imi n’ala iji nwụchikọọ ya bụ onye agboro ahụ, onye riri mbọ mbọ ọsọ.

Hmmmm, nsogbu ụwa!

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close