ỤLỌIKPE NHỌPỤTA IWEPỤ M N’ỌKWA MAKA ENWEZUGHI 25% N’ABỤJA NWERE IKE IBUTE NTISA OBODO – TINUBU



Abụja – Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu enyela ndị ụlọikpe nhọpụta Onyeisiala ịdọakanantị banyere iwepụ ya n’ọkwa maka na ya enwezughi kwanarị iri abụo na ise (25%) na nhọpụta Onyeisiala n’Abụja nwere ike ibute ntisa obodo n’ala Naijiriya.
Nkea sitere n’okwu ọkaikpe ya bụ Wole Ọlanipekun, SAN kwuru na mmechi okwu ya n’ihu ụlọikpe nhọpụta Onyeisiala n’Abụja.
Site n’okwu Ọlanipekun, Tinubu kwetara na ya enwezughi kwanarị iri abụo na ise n’Abụja mana ọ sịrị na o zughi iji chụpụ ya n’ọkwa ebe Kọmishọọnụ na-achịkọba nhọpụta n’ala anyị bụ INEC enyewo ya mmeri.
O kwuru sị, “Nkọwa ya ọzọ ọbụla karịa nkea ga-ebutenwu ịkpọdo ihe isi n’ala, ntisa obodo, ọgba aghara tinyekwara igbanwe ebumnobi iwu ahụ.
“Ndị ụlọikpe ala anyị na akpachapụ anya n’ ụzọ ha si akọwa iwuala, nke ha gosiri na mkpebi dị iche iche ha nyeworo n’oge gara aga’
O kwukwara na Tinubu gakwararịị imeri na nhọpụta ahụ ma ọ bụrụgodi na o nwetaghi mbinyeaka ọbụla chaa chaa n’Abụja tinyekwara otu steeti ọzọ.
Kaosiladi, Mazị Pita Obi na Alahaji Atiku Abụbaka, ndị ji aha òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị Labour Party,LP na nke Peoples Democratic Party, PDP n’ótù n’ótù were zọọ ọkwa Onyeisiala.
Ndị Ọkaiwu Tinubu na-ekwu banyere mpaghara iwuala Naijiriya kwuru na ọ bụ iwu na onye ọbụla na-azọ ọkwa Onyeisiala ga-enwetarịrị opekata mbinyeaka ruru kwanarị iri abụo na ise n’Abụja tupu o tozuo ịkpọlite dịka onye nwere mmeri na nhọpụta ahụ.

Kaosiladị, Ọlanipekun na ndị ọkaiwu Tinubu na-agwa ndị ọkaiwu ụlọikpe nhọpụta Onyeisiala ka ha ‘wetuo obi ala’ ghara ịkọwa iwu ahụ etu ga-aghasa ihe.
Okwu banyere nkọwa iwu ahụ abụrụla ihe na-ada okwu na Naịjiriya taa maka na e nwebeghi nkwekọrịta n’okwu ahụ.


