AKỤKỌ ỤWA
ANWỤRỤ ỌKỤ SI N’ÍGWÈ ỌKỤ EGBUOLA MMADỤ ANỌ N’IME OTU EZINỤLỌ


Ịlọrịn: Oke ọdachi dakwasịrị ndị Sanmora dị n’Okpuru Ọchịchị Irepodun nke Kwara Steeti ụbọchị Wenzdee, oge anwụrụ ọkụ si n’ígwè ọkụ (generator) gburu mmadụ anọ n’ime ótù ezinụlọ.
Ọdachi ahụ tara isi di nwe ụlọ, nwunye ya abụọ na ótù n’ime ụmụ ya, ụmụ ya abụọ nọzị n’ụlọ ọgwụ ebe a na-azọ ndụ ha.
Ótù onye ezinụlọ ahụ kwuru sị: “Ha tinyere ígwè ọkụ hapụ ya n’ime ụlọ were lakpuo n’abalị Tuuzdee.
“N’ụtụtụ, ihe anyị hụzịrị bụ ozu ha. Ekpere anyị ka a zọta ndụ ụmụ ha abụọ ndị nọ n’ụlọ ọgwụ, n’agbanyeghị na ọnọdụ ha dị oke njọ”
Oge ndị nta akụkọ kpọtụrụ ya, Ọnụ na-ekwuru ndị Uwe Ojii na steeti ahụ, Okasanmi Ajayi kwuru na ya bụ ihe mere n’eziokwu.