AKỤKỌ ỤWA

A NWUCHIKỌWO NWOKE ZURU LAPTOP N’IME ỤGBỌELU IBOM AIR NA-ACHỌ IFELI

Legọs – Aka akparala Ogheneochuko Devidi, onye zuru ‘laptop’ onyeije ibe ya ka ụgbọelu Ibom Air na-aga Abụja na-achọ ifeli, ụbọchị Wenezdee gara aga.

Aniekan Essienette, ọnụ na-ekwuru ụlọ ọrụ Ibom Air kwuru nke a n’ozi o zigara ndi nta akụkọ.

Aniekan kwuru na nwoke nwe ya bụ ‘laptop’, bidoro inyo nwaamadị ahụ enyo ka ọ hụrụ ka o si agagharị. Ọ gazịrị mepee akpa ya ọ dọsara n’elu ùkó mana ọ hụghịkwa ya.

O tiziri mkpu mere na a kwụsịrị ụgbọelu ahụ ifeli were chọwa ya bụ ‘laptop’. Ka achọgharịchara ya ihe ruru nkeji iri atọ, e mèchàrà nweta ya n’aka ya bụ onye ohi.

A chụturu ya ozigbo nyefee ya n’aka ndị Uwe ojii ebe onye nwe ya bụ ‘laptop’ ritukwuru iji nyere ndị Uweojii aka na nnyocha ha na -eme.

Ndi Uweojii kwukwara na nwaamadị eteelarịị o ji ezubu ndị njem ohi n’ime ụgbọelu.

Tufịakwa! Nwoke nke a enyewo onye ya unyi n’ihu.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close