AKỤKỌ ỤWA
AKA AKPARALA KAS D,ONYE EBỌNYỊ NA -ETIPỤTA EGWU JIRI MAKA ENYI YA NWANYỊ GAA OHI ỤGBỌALA




Enugwu – Aka ndị Uwe Ojii akparala Kas D, onye Ebọnyị na-etipụta egwu (music producer) ka ọ na-achọ ịpụnahụ ụgbọala Toyota Camry ótù nwaanyị n’Enugwu.
Ozi hoo!haa!!nwetara na-egosi na ya bụ nwokorọbịa, ka ọ na-ahapụ Abakaliki, gwara enyi ya nwanyị ka ọ ga zụta ụgbọala n’Enugwu.
Kaosiladi, ọmalincha nwokorọbịa a ego anọghị n’akpa rutere Enugwu hụ na o jighị ego ịzụ ụgbọala. Karịa ijiri nwayọọ laghachi gaa gbawa mbọ, onye nzuzu ahụ jiri ihere loo ụkwara. Ọ hapụrụ ịzụ ụgbọala gawazie izu ụgbọala, ebe ndị Uwe Ojii nọrọ nwụchikọọ ya.
A gbara ya ọtọ, wụọ ya ị́ga n’aka ma kụkwaa ya ihe ndị ụzụ na akụ ígwè.
He was arrested while trying to snatch a car from a woman in Enugu.


