AKỤKỌ ỤWA

AKA AKPARALA ỌKPỤISI ỊLỌRỊN ENYI YA NWANYỊ NWỤNAHỤRỤ N’ELU AKWAMIKO

Ịlọrịn – Aka ndị Uweojii Ngalaba Kwara Steeti akparala ótú nwaamadị onye ọ̀kpụ́isi, onye enyi ya nwanyị nwụnahụrụ ka ha nọ n’elu akwamiko ụbọchị Mọnde, n’ụlọ nkwari akụ nta dị n’ógbè Temidire, Ịlọrịn, Kwara Steeti.

Ụfọdụ ndị mara ihe mere na-ekwu na ya bụ nwaamadị ṅụrụ ọ́gwụ̀ nkeli útù tupu dakwasị ya bụ enyi ya nwanyị laworo mmụọ.

Kaosiladị, nwa agbọghọ nọgidere kwuwe na ume na-ekoropuzi ya. Oge ọ hụrụ na okwu apụwo n’egwu, ọ̀kpụ́isi tìrì mkpu enyemaka mere ndi nọ nso jiri gbara ọsọ nyere ya aka buga enyi ya nwanyị ụlọ ọ́gwụ̀. Ndị ụlọ ọ́gwụ̀ kwuziri hoo!haa! na ya bụ nwa agbọghọ anwụọlarịị.

N’okwu ya, Ọnụ na-ekwuru ndị Uweojii na steeti ahụ, SP Okasanmi Ajayi kọwara na ime nnyocha ka na-aga n’ihu banyere ọnwụ nwa agbọghọ ahụ.

Nsogbu ụwa, ọ̀kpụ́isi a bụkwa onye ajọ chi. Kedu ihe meziri o jiri tọ n’ebe ibe ya na-agba ala?

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close