AKỤKỌ ỤWA
ATỌRỌWO NDI NWUNYE ONYEISIOCHE OKPURU ỌCHỊCHỊ KIYAWA, JIGAWA STEETI



Dutse – Ndị òjìégbè nọ ụbọchị Fraidee tọrọ ndị nwunye abụọ nke Onyeisioche Okpuru Ọchịchị Kiyawa na Jigawa Steeti.
Ozi hoo!haa!! nwetara na-ekwu na ndị ekperime ahụ dabatara n’obodo bido gbaliwe égbè elu mere ka onye ọbụla gbalaga. Ha wakpoziri ụlọ Onyeisioche ahụ tọrọ ndị nwunye ya abụọ nke ótù n’ime ha dị ime ọmụmụ.

SP Lawal Shisu Adam, Ọnụ na-ekwuru Ndị Uweojii na steeti ahụ kwuru na ha zigara ndị uweojii ebe ahụ, ozigbo ha nwetara ozi ahụ.
Kaosiladị, ezinụlọ nwaamadị ahụ na-akọwa na ha enwetabeghi ozi ọbụla n’aka ndị ntọ ahụ.
Nsogbu ụwa! Ihe anyị nọzị bụ “Chizọba”


