AVM SI N’ỤGBỌELU NDỊ AGHA RỊTUO RỊGORO “ALTAR” DỊKA ỤKỌCHUKWU – SINETỌ BENT


Abụja: Sinetọ Grace Folashade Bent akọwaala AVM Kris Ndubuisi Chukwu, laworo ezumike dịka ezigbo nwaamala n’enweghị atụ, onye nke si n’ụgbọelu ndị agha rituo were rịgoro n’altar dịka ụkọchukwu.
Sinetọ Bent kwuru nke a ụbọchị Fraịdee n’ogige National Defence College, Abụja n’oge Mmemme Mwepụta Akwụkwọ Ọchịagha Ụgbọelu AVM Kris Ndubuisi Chukwu dere banyere onwe ya aha ya bụ “Wings of Distinction” nke kọwara ike nile odogwu nwoke ahụ kpara n’ime afọ iri atọ n’asaa ọ nọrọ na ndị agha Ụgbọelu Naịjiriya.
Ọ kọwara Chukwu dịka ótù onye Ịdịnotu Naịjiriya na anụ ọkụ n’obi.
“A na m eto gị maka ịhapụ Ala-Igbo bịa lụrụ nwanyị na Mgbago Ugwu na Ndịda Kaduna dịka di m siri sikwa ébó Bachama n’Adamawa Steeti bịa lụrụ m bụ nwunye ọ hụrụ n’anya n’Osun Steeti.
Onyeisi Oche mmemme ahụ, Omenka Hassan Adamu, Mịnịsta na – ahụ maka Okwu Mmiri onye ya na Odèè ahụ gụkọrọ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ Federal Government College, Kano kọwara Chukwu dịka onye na-etinye mmụọ ya nile n’ihe ọbụla ọ na-eme, ma bụrụkwa onye kwesịrị nṅomi.
Na mbụ n’okwu ya, onye nkọwapụta akwụkwọ ahụ, AVM Kịnslị Lar, laworo ezumike kwuru na akwụkwọ ahụ nke nwere isi iri abụọ n’abụọ jupụtara n’ihe mmụta ga-enyere mmadụ aka izeere ihe iche aka mgba dị iche iche na-adapụta na ndụ, ọ kacha ndị agha ụgbọelu.
N’okwu nke ya, Minista na – ahụ maka Sayensị na Nkanụzụ, Dọkịnta Ogbonnaya Ọnụ kọwara AVM dịka ezigbo nwaamala, onye jiri ọgụgụ isi Chineke nyere ya were fee ala nna ya.
Ichie Dọkịnta Sịrịịlụ Ole, Onyeisi Òtù Nenwe Integrity Foundation (NIF) mere ka o doo ụwa nile anya na AVM Chukwu bụ onye ndị Nenwe ji eme ọnụ maka na ọrụ ọma ya ruru ụlọ.
Ndi oọzọ nwere agba bịara mmemme ahụ gụnyere Mazị Odozi Nwodozi, Onyeisi Oche Ohaneze Ndigbo, Ngalaba Abuja, Dọkịnta Lọọ̀ Mefọ, Onye Nlekọta Òtù Igbo bụ Igbo Foundation (IBI), wdg.