AKỤKỌ ỤWA

CHAI! MGBIDI ADAGBUWO NWOKE ONDO KA Ọ NA-AZỌPỤTA NWA YA NWOKE

Akure – N’Akure, Ondo Steeti, ótù nwaamadị, Titus Adega aburuwo onye tufuru ndụ ya oge o jì ahụ ya kpuchite nwa ya nwoke, Kizito, onye dị afọ ise, ka mgbidi ụlọ ha zere n’oge nnukwu mmiri na-ezo.

Ndị agbataobi kwuru na mgbidi azụ ụlọ ha zere n’oge nnukwu mmiri ozuzo.

Njinji ahụ jiri n’Okporoụzọ Itedo Eledumare, dị n’ógbè Oba-Ile n’Okpuru Ọchịchị Mgbago Ugwu Akure.

Oriakụ Margaret Adega, onye di ya lara mmụọ kwuru na ọ bụ mkpu akwa nwa ya nwoke ahụ mere o ji gbara ebe ahụ.

“A nọ m n’ụra were nụ mkpu akwa nwa m nwoke. Oge m bịara ịdọpụta ya ka m hụzịrị ahu di m dakwasara ya n’elu.

” E tikuziri m ndị agbataobi ndị bịara nyere m aka. Di m ji ahụ ya kpuchite nwa m nwoke iji zọpụta ndụ ya

” E buru ha abụọ gbagawa ụlọ ọgwụ. Kaosiladị, oge erutere ụlọ ọgwụ, ndị Dọkịnta kwuru na di m anwụọlarịị”

Chai! Ezi nna e werela ndụ ya chụọ àjà maka nwa ya nwoke. Ka mkpụrụ obi odogwu nwoke a zuru ike na ndokwa. Iseeeeeee!!!!

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close