AKỤKỌ ỤWA

NDỊ NNE, UNU EKWEZILA DI UNU ṄỤỌ ARA UNU, ARA BỤ MAKA ỤMỤ ỌHỤRỤ UNU – KỌMISHỌNA MAKA OKWU NDỊ INYOM N’ENUGWU STEETI

Enugwu: Kọmishọna na – ahụ maka okwu ndị Inyom n’Enugwu Steeti, Hon. Peace Nnaji, agwala ndị nne ka ha kwụsị inye di ha ara, nyewe sọọsọ ụmụ ha mụrụ ọhụrụ.

Nnaji, n’okwu ya n’oge mkparịta ụka ụlọ ọrụ UNICEF chịkọbara maka ndị nta akụkọ si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda, Ndịda Ndịda na Obinetiti,dọrọ ndị nne aka na ntị ka ha ghara ikwe ka ndị di ha na ụmụ ha na-azọ ara ha.

“E mebere mmiri ara maka nwa a mụrụ ọhụrụ ọ bụghị maka nwoke.

“Ọ dịkwa njọ na ndị nne ji ka ara ha ghara ịda were jụ inye ụmụ ha ara”

Kọmishọna ahụ rịọkwara ndị nne ka ha gbaa mbọ jiri sọọsọ mmiri ara ha were zuo ụmụ ọhụrụ ha n’ọnwa isii mbụ ha.

Onye Nlekọta ụlọ ọrụ UNICEF ngalaba Enugwu, Dọkịnta Ibrahim Conteh nọrọ n’okwu nke ya rịọ ndị nne ka ha jiri sọọsọ mmiri ara ha were zụọ ụmụ ọhụrụ ha n’ọnwa isii mbụ ha maka na o nweghị mmiri ara ehi dị mma ruo ka mmiri ara nwanyị mụrụ nwa.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close