AKỤKỌ ỤWA
NKỊTA ATAGBUWO NWAANYỊ NAỊJIRIYA N’ITALY



Ebelebe gburu n’abalị ụbọchị Mọnde a, oge ìgwè nkịta tagburu Patricia Masithela, nwaanyị Naịjiriya dị iri afọ abụọ na asaa na Latina dị na mpaghara Lazio n’Italy
Ozi hoo!haa!! nwetara na-ekwu na ya bụ nwaanyị laworo mmụọ bịara ịhụ enyi ya nwoke mana o kwudoghi ya.
Ìgwè nkịta ndi ahụ agụụ ji makwasịrị ya, were taa ya ntasa. Mkpu ákwá ya meziri ka agbataobi gbata ọsọ enyemaka.
Ndi Uweojii gbatazịrị gbagbuo nkịta abụọ tupu ndi ọzọ hapụ ya gbalaga.
Kaosiladi, ọ nwụzịrị n’ụlọ ọ́gwụ̀ site n’oke mmeruahụ nakwa ọbara gbara ya.
Ndi mara Patricia, onye ha hapụrụ nwa nwaanyị dị afọ ise were laa mmụọ dịka onye obi ọma.
Chai! Chukwu, biko wepụrụ mmadụ udiri ọnwụ ike a. Ka mkpụrụobi ya zuru ike na ndokwa. Ise!


