AKỤKỌ ỤWA

NKỊTA ATAGBUWO NWAANYỊ NAỊJIRIYA N’ITALY

Ebelebe gburu n’abalị ụbọchị Mọnde a, oge ìgwè nkịta tagburu Patricia Masithela, nwaanyị Naịjiriya dị iri afọ abụọ na asaa na Latina dị na mpaghara Lazio n’Italy

Ozi hoo!haa!! nwetara na-ekwu na ya bụ nwaanyị laworo mmụọ bịara ịhụ enyi ya nwoke mana o kwudoghi ya.

Ìgwè nkịta ndi ahụ agụụ ji makwasịrị ya, were taa ya ntasa. Mkpu ákwá ya meziri ka agbataobi gbata ọsọ enyemaka.

Ndi Uweojii gbatazịrị gbagbuo nkịta abụọ tupu ndi ọzọ hapụ ya gbalaga.

Kaosiladi, ọ nwụzịrị n’ụlọ ọ́gwụ̀ site n’oke mmeruahụ nakwa ọbara gbara ya.

Ndi mara Patricia, onye ha hapụrụ nwa nwaanyị dị afọ ise were laa mmụọ dịka onye obi ọma.

Chai! Chukwu, biko wepụrụ mmadụ udiri ọnwụ ike a. Ka mkpụrụobi ya zuru ike na ndokwa. Ise!

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close