ỤMỤ NWANYỊ NAỊJIRIYA NỌZỊ NA NKWANYE, NTỤTỤ, MBỌ́, NKU ANYA, ÁRÁ, ÍKÈ – EDOCHIE


Enugwu: Hmmmm! Ọgadagidi Pete Edochie ekwuola ọzọ!
Ochie dike omebeihenkiri Nollywood a, onye okwu ya na-ada ụda gosipụtara mwute ya etu ụmụ nwanyị Naịjiriya taa si akwanyezi ihe nile akwanye.

Ọgadagidi nọrọ n’ihe onyonyo o tinyere n’Instagram were jụọ sị: “Kedu udiri árá na ayịzị ụmụ nwanyị Naịjiriya, ma ụmụ agbọghọ, ma ndị agadi?
“Taa, ọ hịara ahụ ịhụ nwa agbọghọ ka dị ka chi si kee ya. Ha kwanye ntụtụ, ha akwanye nku anya, kwanye mbọ́, kwanyekwuo ma árá ma íkè. Akụkụ ahụ gị nile bụzị adigboroja, o nweghịkwa nke dị ka chi si kee ya. A maghị m ihe mere ihe a ji ayịzị ụmụ agbọghọ anyị árá”
O kwukwara na ya mara na okwu ya ahụ ga-ebutere ya nkatọ nakwa akọm ọnụ.
“Ha kọọ m ọnụ etu masịrị ha, ma ha gwanụ m ihe ha ji ayị udiri árá a. Kparịanụ m, o nweghị ihe o wepụrụ m n’ahụ.
“Ụfọdụ ụmụ agbọghọ na-anwụ ebe ha gara ụlọ ọgwụ ịkwanye íkè buru ibu. Chineke zọba anyị”
Oge gara aga, ochi dike a nwetara nkọcha maka okwu ya na nwoke isekpu ala nye nwa agbọghọ ọ chọrọ ịlụ mgbaaka bụ nzuzu