AKỤKỌ ỤWA

AGBAM AKWỤKWỌ NZUZO: DAYỌSISI WỌ̀RỊ́ AKWỤSỊWO FADA HA ỌRỤ

Wọrị – Dayọsisi Ụka Katọliki nke Wọ̀rị́ akwụsiwo ótù ụkọchukwu, Fada Daniel Okanatotor Oghenerukevwe ọrụ ụkọchukwu maka agbam akwụkwọ nke ya na Nwaada Dora Chichah na Dallas, Texas, USA.

Ozi sitere n’aka Bishọọpụ Antoni Ovayero Ewherido na odeakwụkwọ ukwu Dayọsisi ahụ, Fada Klementị ụbọchị Tọzdee kwuru na nkea bụ maka na ọ dara iwu nke ụka katọliki.

Ya bụ agbam akwụkwọ e mere n’abalị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Disemba, wusara ebe nile n’ọbaozi mmekọrịta nke mere Ụka Katọliki jiri nye Fada ahụ ntaramahụhụ nkwụsị ọrụ.

Nke a pụtara na o nweghịkwa ikike ịrụ ọrụ dịka ụkọchukwu.

Kaosiladị, Bishọọpụ Ewherido kọwara na Fada ahụ ka nwere ikike ịrịọ ka elebagharịa okwu ahụ anya ma ọ bụrụ na o gosi mmụọ nchegharị.

Dayọsisi ahụ rịọkwara ekpere n’isi Fada ahụ ka o chegharịa ma chighaa azụ.

hmmmm, nsogbu ụwa. Ịbụ ụkọchukwu ụka Katọliki adịghị mfe, ọ bụ sọọsọ site n’amara Chineke ka nwoke ka e ji kweta ma debenwuo iwu iji ahụ chụọ àjà site n’alụghị nwaanyị ma ọ bụ nwee mmekọahụ ruo n’ọnwụ. Biko, Chineke, nyere ndi kwetara ime nkea aka ha ka kwudosie ike ruo na ngwụcha. Iseeee!

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close