AKỤKỌ ỤWA

ỊLỤ ỌGỤ NDỌRỌNDỌRỌ ỌCHỊCHỊ GA-EME Ị KAA AKA, BỤRỤ ỌCHỊAGHA – JONATHAN NA-AGWA FUBARA

Ígwéọ́chá – Onye bụbu Onyeisiala Naịjiriya, Dọkịnta Goodluck Jonathan agwawo Aka na-achị Steeti Rivers, Siminalanyi Fubara, ka o kee ájị̀ n’ume ma lịa obi dịka dike iji were merie ihe iche aka mgba nile kwụchiri ya ụzọ, ka o were turu ugo.

Ọ gwakwara Fubara na ịlụ ọgụ ndọrọndọrọ ọchịchị ọ nọ n’elu ya ga-eme ka ọ kaa aka, bụrụzịa ọchịagha na ndọrọndọrọ ọchịchị steeti ahụ.

Jonathan kwuru nke a na Nihi dị n’Okpuru Ọchịchị Etche, oge ndi eze ọdịnala ala Etche chiri ya Dike Ọha mke mbụ n’Etche.

Jonathan kwuru sị, “A ma m ihe ị na-agabiga. Chetakwa na onye agaghị agha anaghị abụ ọchịagha. Ihe iche aka mgba ndi a ị na-agabiga ga-eme ka ị kaa aka ma bụrụkwa ọchịagha na ndọrọndọrọ ọchịchị steeti Rivers. Site mbọ ị na-agba nakwa nkwado ndi steeti Rivers, Chukwu ga enye gị mmeri”

O kwukwara na ọ dị oke mkpa inwe udo na steeti ahụ maka na ihe ọbụla metụtara Steeti Rivers metụtara Naịjiriya.

N’okwu ya, Fubara kelere ndi Etche nakwa ndi Ikwerre maka nkwado ha na-enye ya.

“Unu ma na-enyewo ọrụ maka ụzọ ndi dị n’Afara, Egwi nakwa Mba. N’ọnwa ole n’ole dị n’ihu, anyị ga-alọghachi ịbịa gbapee ụzọ ndi ahụ.

N’okwu nke ya, Onyeisioche mmemme ahụ, Sinetọ John Azụta Mbata kelere Gọvanọ Fubara n’ọrụ ọma, ma rịọkwaa ya ka ọ ghara ịda mbà.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close