AKỤKỌ ỤWA
EJIDELA NWATAKỊRỊ NWANYỊ JI ÉGBÈ BỊA AKWỤKWỌ ỊGBA ONYE NKUZI YA


Kalaba: Aka akparala nwata akwụkwọ ji égbè bịa akwụkwọ Ụlọ akwụkwọ Sekọndịrị ji égbè bịa akwụkwọ na Krọs Riva Steeti.
Obere nwa-ada ahụ sịrị na ọ bụ onye nkuzi mere ka ọ kpụchapụ ihe o tere na ntụtụ isi ya ka ọ chọrọ ịgba égbè.
Ka a hụzịrị égbè ahụ, ndị isi ụlọ akwụkwọ ahụ bụ Government Secondary School, Ikot Ewa kpọrọ ndị soja ndị bịara kpụrụ ya.


