AKỤKỌ ỤWA

A KỤỌLA ỤMỤ NWANYỊ ABỤỌ GWOO GWOO MAKA ỊZỤ OHI N’ỌNỊCHA

Ọnịcha : Ụmụ nwanyị abụọ a nwuchikọrọ ka ha zuru akpa mmadụ ego juru na Bethel Plaza, Ọnịcha ka a kụrụ gwoo gwoo, gbakwaa ha ọtọ.

Ụmụ nwanyị ahụ mere ka ha a chọrọ ịzụ ahịa n’ụlọ ahịa ebe a na-ere ákwà ụmụ nwanyị.

Ka onye nwe ụlọ ahịa ahụ na-eresi onye ọzọ ahịa, ha buru akpa ahụ ego dị na ya karịrị Puku Narị Naira anọ (N400, 000) were mịpụ.

Chi ha gburu ha oge onye nwe ụlọ ahịa hụ chọrọ itinye ego n’akpa ahụ were rachaa mkpu oge ọ hụghịzị akpa ego ahụ.

Ụmụ ahịa ya chụwazịrị ma nwude ụmụ nwanyị ahụ tupu ha agatee aka.

E konyela ụkwụ ụgbọala (tyre) n’olu iji gbaa ha ọkụ tupu onye nwe ego ahụ a rịọọ ka a hapụ ha.

Tụfịakwa! Ụwa onye ohi adịghị mma.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close