AKỤKỌ ỤWA

GỤỌ AKWỤKWỌ IRI NDI ỌZỌ DERE, TUPU ÍDÉ NKE GỊ -CHUKWUEMEKA, ONYENWE ỤLỌỌRỤ BOLDSCHOLAR


Mazị Chukwuemeka Godswill enyewo ndị òdée na-amalite amalite ndụmọdụ ka ha buru ụzọ gụọ akwụkwọ ndị ọzọ deworo, o pekata mpe, akwụkwọ iri, tupu ha amalite ihe nke ha.

Chukwuemeka, onye bụ onye Ọkpọsị dị n’Okpuru Ọchịchị Ọhaọzara n’Ebọnyị Steeti, nyere ndụmọdụ a oge onye nta akụkọ anyị ghara ya ajụjụ ọnụ n’ụbọchị Fraidee, abalị atọ nke ọnwa Novemba, afọ 2023, n’ọgbakọ Izugbe kwa afọ òtù ndị òdée na Naijiriya bụ Association of Nigerian Authors (ANA) n’olu bekee, nke e mere n’ogige Mamman Vatsa Writers Village, Mpape, Abụja.


Ya bụ nwaamadị, onyenwe ụlọọrụ Boldscholar nọrọ n’oge ahụ were zipụta ńgwá ọgbara ọhụrụ ha mepụtara nke ndi òdée ji etinye akwụkwọ ha n’ọbaozi ikuku (e- Library).


hoo!haa!!:
Biko gwa anyị aha gị
Chukwuemeka: Aha m bụ Chukwuemeka Godswill


hoo!haa!!:
Kedu aha ụlọọrụ I jírí bịa ebe a taa?
Chukwuemeka: Boldscholar Research Limited


hoo!haa!!: Biko, kọọrọ anyị maka ihe ị bịara kpughee ebe a taa
Chukwuemeka: A bịara m kpugheere ndị òdée, ndị nkuzi ma ndi na-ede akwụkwọ, ka ha hụ ebe ha ga na-eme ndị mmadụ ka ha na-agụ akwụkwọ ha. Ihe dịkwanụ akwụkwọ bụ I dee akwụkwọ, mmadụ agụọ maka onye na-esi nri sichaa mmadụ erighi ya, ọ dị ka ọ maghị esi. Mana ndi na-ede akwụkwọ dechaa, ha ahụ ndị ga-agụ ya, ọ gbaa ha ume idekwa ọzọ. Ha enwetakwa ego na nke ha dere ede, obi adị ha mma.


hoo!haa!!: Kedu ebumnobi gị I jiri mepee ya bụ ebe a na-etinye akwụkwọ n’ikuku?
Chukwuemeka: Ebumnobi m bụ inyere ndi òdée aka ka ha na-erite uru n’ihe ha dere, nyekwara ụmụ akwụkwọ aka ka ha n’ahụ ebe ha ga na-agụ akwụkwọ, maka na ọtụtụ ụmụ akwụkwọ na-achọ ebe ha ga na-agụ akwụkwọ ma ha ahụghị, ọ dị ka ndị mmadụ achọghị ịna agụ akwụkwọ kama, ha ahụghị akwụkwọ ha ga na-agụ.


hoo!haa!!: Kedu ka echiche ihe a si wee bata gị n’obi?
Chukwuemeka: Ọ mgbe m lere anya hụ na ọtụtụ ndị na-ede akwụkwọ na-ata ahụhụ, na-agbagharị, achọ ebe ha ga-ere akwụkwọ ha, maka na o nwere ọtụtụ ndị dere akwụkwọ, ha dechaa, ha a na-ebe arịrị, sị na ha depụta ótù akwụkwọ, ndị ọrụ adịgboroja e bigharịa ya bupụta, m sị ka m mepụta ebe ọ ga-abụ ha tinye akwụkwọ ha, o nweghị onye adịgboroja ha ezuru ya, ga bipụta. Yaa, ihe a bụ ihe ga-enyere ha aka


hoo!haa!!: Kedu ihe ị na-agwa ndị na-eto eto, ndí chọkwara ịbụ ndị òdée?
Chukwuemeka:
Ihe m chọrọ ịgwa ha bụ na ha jisi ike na-agụ akwụkwọ maka ị gụọ akwụkwọ, ị mara ka ị ga-esi dee nke gi. Maka na onye na agụghị akwụkwọ, ọ bịa ide ede, o dee ihe enweghị isi. Ọ dị mma, tupu I dee ótù, jisike gụọ iri. Ị gụọ iri, I dee ótù. Ị gụkwaa ọ́gụ́, ọ kakwa mma mana gụọ akwụkwọ tupu I dee akwụkwọ.

hoo!haa!!: Kedu ebe I si n’Ala-Igbo?
Chukwuemeka:
E si m n’Ọkpọsị, n’Ọhaọzara n’Ebọnyị Steeti


hoo!haa!!: Were olu ndi Ọkpọsị kelee ụmụ Igbo
Chukwuemeka: Ndigbo, mmammanụ. Sa ọ dụrụ unu ne mma. Se Chineke gọzikwaa unu

 

 

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close