AKỤKỌ ỤWA

IMO 2023: INEC KPỌLITERE NDI NWỤRỤ ANWỤ HA SORO BINYERE ỤZỌDỊMMA AKA -MMA ODI

Mma Odi, Onye Nlekọta, Ụlọ ọrụ Emma Ezeazu Centre for Good Governance and Account­ability eboola Kọmishọọnụ Nhọpụta Naijiriya, Independent National Electoral Commission (INEC) ebubo ime mpụ nhọpụta dị iche iche iji nye Aka na-achị Imo Steeti, Sinetọ Hope Ụzọdịmma , onye ji aha òtù ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Congress (APC) zọọ ọkwa Gọvanọ na steeti ahụ mmeri.

N’okwu ya, ka ọ na-ekwu okwu na Televishọnụ, nwanyị ahụ a maara maka nkwalite ikike dịịrị mmadụ katọrọ akparamagwa INEC na nhọpụta ahụ e mere ụbọchị Satọdee ka nke jọgburu udele, sigbuo nkakwụ.

“Lee ihe mere na nhọpụta Gọvanọ emegasịrị Satọdee gara aga, ọ kacha n’Imo na Kogi. Akparamagwa INEC dị oke mwute.

“BVAS a gwara anyị bụ ọ́gwụ̀ ga-eme ka mpụ nhọpụta laa kpam kpam arụghịzị ọrụ.

“INEC gwara anyị na ị gaghị etozu ime mbinyeaka ma ọ bụrụ na BVAS ebuputaghị aha gị, na BVAS ga-egosikwa mmadụ ole tozuru iso mee mbinyeaka n’ogige mbinyeaka ọbụla. Kaosiladị, ihe INEC meziri n’Imo nakwa n’ebe ndị ọzọ dị oke mwute kwesịkwa nkatọ.

“INEC gara kpọlite n’ọnwụ ndị nile e gburu egbu na mpaghara Ọ̀lụ́ nakwa Ọ̀kígwé, ha soro mee mbinyeaka. Ọ bụladị n’ogige mbinyeaka ndị INEC ezigaghị ndị ọrụ ha, ha dekwara mpụtara nhọpụta maka ebe ndị ahụ. Ha kere ogige mbinyeaka n’ala mmụọ, bugakwa ngwa nhọpụta n’ebe ndị ahụ ma gụnyekwuo mpụtara nhọpụta si n’ebe ndị ahụ”

Naịjiriya ndo! A na-ekwu nke mere, ọzọ a na-eme. Chai!

“INEC created results in their imaginations and uploaded the same even where there were no polling units and people were not seen to have come out and vote,” she alleged.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close